YouVersion Logo
Search Icon

AISAIA 18

18
1Ahuhu gādiri ala ùzù nke ọtutu nkù, nke di n'ofè osimiri nile nke Etiopia: 2nke nēziga ndi-ukọ̀ n'oké osimiri, ọbuná n'ub͕ọ papyrus di iche iche n'elu miri! Unu ndi-ozi nkọ, jekurunu otù mba ndi di ogologo di kwa lari n'aru, rue otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta atùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya! 3Unu ndi nile nēbi n'elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n'uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n'elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu, 4N'ihi na otú a ka Jehova siworom, M'gānọ jū, M'gēlegíde kwa anya n'ebem guzosiri ike; dika okpom-ọku nēnwu enwu n'ìhè anyanwu, dika alulu igirigi n'okpom-ọku nke owuwe-ihe-ubi. 5N'ihi na tutu owuwe-ihe-ubi erue, mb͕e ifuru zusiri okè, na mb͕e okoko nāghọ nkpuru-vine nāchaghi acha, O gēji mma-nkwacha bipu umu-alaka-ya, ọ bu kwa alaka-ya nile ka Ọ gēwezuga b͕uchapu. 6Agārapu ha n'otù nye udele nke ugwu, nye kwa anu-ọhia nke uwa: udele gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e okpom-ọku, anu-ọhia nke uwa gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e oyi. 7Na mb͕e ahu ka agēdukuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha ùtú, nke bu otù ndi di ogologo di kwa lari n'aru, nke site-kwa-ra n'otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya, rue ọnọdu aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ugwu Zaion.

Currently Selected:

AISAIA 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in