HOSEA 12
12
1Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt. 2Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya. 3Mb͕e ọ nọ n'afọ o jidere nwa-nne-ya n'ikiri-ukwu; ọ bu kwa n'ume-ya ka o jisiri ike n'ebe Chineke nọ: 4o we jisie ike n'aru Mọ-ozi, we nwe ike kari: ọ kwara ákwá, riọ Ya aririọ: nime Bet-el ka Ọ chọtara ya, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ kpayere ayi uka; 5ọbuná Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha; Jehova bu aha-ncheta-Ya. 6Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.
7Kenean! n'aka-ya ka ihe-ọtùtù aghughọ di: ọ huru imeb͕u emeb͕u n'anya. 8Efraim we si, N'ezie aghọwom ọgaranya, achọtaworom onwem àkù: ihe nile m'nādọb͕u onwem n'ọlu inweta agaghi-achọtaram ajọ omume nke bu nmehie. 9Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; M'gēme kwa ka i biri n'ulo-ikwū ọzọ, dika n'ubọchi nile nke mb͕e akara àkà. 10Agwawokwam ndi-amumam okwu, ọ bu kwa Mu onwem mere ka ọhù ba uba; ọ bu kwa site n'aka ndi-amuma ka M'ji ihe ama àtù. 11Ọ buru na Gilead bu ajọ ihe, nání ihe-efu ka ha ghọworo; nime Gilgal ha nāchu àjà oke-ehi di iche iche: e, ebe-ichu-àjà nile ha di ka obo-ihe n'ọ̀b͕à ubi. 12Jekob we b͕alaga n'ọhia Efraim, Israel we fè òfùfè n'ihi nwunye, ọ bu kwa n'ihi nwunye ka o debere aturu. 13Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya. 14Efraim akpasuwo iwe oké ilu: ọ bu kwa iwusi-ọbara-madu-ya ka Ọ gārapu n'aru ya, ọ bu kwa ita-uta-ya ka Onye-nwe-ya gēnyeghachi ya.
Currently Selected:
HOSEA 12: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.