NDI-HIBRU 8
8
1Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe, 2Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu. 3N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke. 4Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ: 5ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu. 6Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma. 7N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua. 8N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si,
Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru,
Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;
9Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara
N'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha;
N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum,
Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,
10N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a
Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;
M'gētiye iwum n'uche-ha,
Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ:
M'gābu-kwa-ra ha Chineke,
Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:
11Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya,
Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi:
N'ihi na ha nile gāmatam,
Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.
12N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere,
M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.
13Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.
Currently Selected:
NDI-HIBRU 8: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.