YouVersion Logo
Search Icon

NDI-HIBRU 3

3
1Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus; 2na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum. 3N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya. 4N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke. 5Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu; 6ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile. 7N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi,
Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,
8Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu,
Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia,
9Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem,
Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.
10N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a,
M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha:
Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;
11Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si,
Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.
12Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ: 13kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie: 14n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile: 15n'oge anēkwu, si,
Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,
Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu.
16N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses? 17Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia? 18Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi? 19Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n'ihi ekweghi-ekwe.

Currently Selected:

NDI-HIBRU 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy