YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 11

11
1Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu. 2O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu. 3Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ. 4Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile. 5Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru. 6Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime. 7Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha. 8Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu. 9N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.
10Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri: 11Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
12Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela: 13Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
14Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba: 15Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
16Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg: 17Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
18Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu: 19Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
20Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug: 21Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
22Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa: 23Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
24Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira: 25Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
26Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.
27Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot. 28Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea. 29Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska. 30Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere. 31Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu. 32Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.

Currently Selected:

JENESIS 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy