YouVersion Logo
Search Icon

EZRA 7

7
1Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia, 2nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub, 3nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot, 4nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki, 5nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà: 6Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya. 7Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze. 8O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze. 9N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya. 10N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel.
11Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel. 12Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a. 13Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je. 14N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem; 15na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem, 16na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem; 17n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem. 18Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme. 19Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem. 20Ma nke fọduru n'ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n'ulo àkù eze nye ya. 21Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa, 22rue ọgu talent ọla-ọcha ise, ru kwa ọgu cor ọka wheat ise, ru kwa ọgu bath manya-vine ise, ru kwa ọgu bath manu ise, na nnú nke anēdeghi akwukwọ ọtùtù-ya. 23Ihe ọ bula nke putara n'iwu Chineke nke elu-igwe, ka eme ya n'uzọ ziri ezi nye ulo Chineke nke elu-igwe; n'ihi na, n'ìhi gini ka iwe gādi megide ala-eze nke eze na umu-ya ndikom? 24Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n'aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ. 25Ma gi onwe-gi, Ezra, dika amam-ihe nke Chineke-gi nke di n'aka-gi si di, guputa ndi-ikpe na ndi-odozi-okwu, ndi gāburu ndi nile nọ n'ofè osimiri, bú ndi nile mara iwu Chineke-gi, ndi-odozi-okwu; me-kwa-nu ka ọ mara iwu ahu, bú onye nāmaghi. 26Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n'ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n'ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u.
27Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, bu, Onye tiyeworo ihe di otú a n'obi eze, nime ka ulo Jehova nke di na Jerusalem ma nma; 28Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.

Currently Selected:

EZRA 7: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in