YouVersion Logo
Search Icon

EZIKIEL 42

42
1O we me ka m'puta ba n'ogige ahu di n'èzí, n'uzọ ahu nke di n'uzọ Ugwu: o we me ha m'ba n'ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n'akuku Ugwu. 2N'iru ogologo nke ọgu cubit ise ka ọnu-uzọ nke Ugwu di, obosara-ya di kwa ọgu cubit abua na iri. 3Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ. 4N'iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n'obosara n'ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n'Ugwu. 5Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu. 6N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala. 7Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri. 8N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise. 9Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha. 10N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di. 11Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di. 12Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha. 13O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ. 14Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.
15Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile. 16O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu. 17O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Ugwu buruburu, nnù ami na ọgu ise. 18Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya. 19O chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise. 20N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.

Currently Selected:

EZIKIEL 42: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in