YouVersion Logo
Search Icon

ỌPUPU 28

28
1Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n'etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron. 2I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma. 3Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M'mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja. 4Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n'úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà. 5Ndi ahu gēwere kwa ọla-edo ahu, na ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.
6Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà. 7Ọ gēnwe kwa ubu abua ejikọtara na nsọtu-ya abua; ka ewe jikọta ya n'otù. 8Ihe-ọkiké nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, ọ gādi ka ọlu aluru ya si di, o gēsite kwa na ya; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. 9I gēwere kwa nkume onyx abua, b͕unye aha umu Israel n'elu ha: 10itinye aha ha n'elu otù nkume, aha nke umu Israel isī nke fọduru n'elu nkume nke-ọzọ, dika ọmumu nile ha si di. 11Ọlu nke onye-ọ̀kà na nkume ka a gēji b͕u eb͕ub͕u nkume abua ahu, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di: i gēme ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu. 12I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.
13I gēme kwa ihe ọla-edo akpara akpà: 14na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà. 15I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya. 16Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa. 17I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu; 18eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond; 19eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst: 20eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha. 21Nkume ahu gādi ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha gādiri ebo iri na abua ahu. 22I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu; ha gābu ọla-edo anāgwaghi agwa. 23I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi. 24I gētiye kwa iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu. 25Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, i gētiye ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu n'ebe iru-ya di. 26I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime. 27I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara. 28Ha gēwere kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu. 29Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum. 30I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum.
31I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu. 32Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya. 33I gēme kwa n'ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n'ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n'etiti ha buruburu. 34Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu. 35Ọ gādi kwa n'aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ n'iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu.
36I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE. 37I gātukwasi ya n'eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n'ákwà-nkukù-isi ahu; n'iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi. 38Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova. 39I gātu-kwa-ra uwe-ime-ya nke ezi ákwà ọcha agwa, i gēme kwa akwa nkechi nke ezi ákwà ọcha, i gēme kwa ihe ike n'úkwù, ọ gābu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà. 40Umu-ndikom Eron ka i geme-kwa-ra uwe-ime, me-kwa-ra ha ihe ike n'úkwù, ihe ike n'isi ka i gēme-kwa-ra ha, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma. 41I gēyi-kwasi ha n'aru Eron, bú nwa-nne-gi, na n'aru umu-ya ndikom tiyere ya; i gēte kwa ha manu, meju aka-ha, do ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà. 42Gi me-kwa-ra ha uwe-úkwú ákwà ọcha ikpuchi anu-aru ọtọ-ha; site n'úkwù we rue apata-ukwu ka ha gādi: 43ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.

Currently Selected:

ỌPUPU 28: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in