YouVersion Logo
Search Icon

DEUTERONOMI 13

13
1Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube, 2ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n'azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè; 3egela nti okwu onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, nānwà unu, ima ma unu nēwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile hu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya. 4Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n'azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n'iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n'aru. 5Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
6Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà; 7ndi sitere na chi nile nke ndi nile nọ unu buruburu, ndi nọ nso gi, ma-ọbu ndi nọpuru gi n'ebe di anya, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa); 8ekwela ya, ege-kwa-la ya nti; anya-gi agaghi-emere ya ebere, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya, ekpuchi-kwa-la ya: 9kama i ghaghi ib͕u ya; aka-gi gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. 10I gēwere nkume tub͕ue ya, ka o we nwua; n'ihi na ọ chọwo iduhie gi n'akuku Jehova, bú Chineke-gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta. 11Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n'etiti gi.
12Mb͕e i gānu okwu n'otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n'ebe ahu, si, 13Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha); 14i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'etiti gi; 15i ghaghi iwere ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi n'obodo ahu, were mma-agha wezuga ya, na ihe nile di nime ya, na anu-ulo-ya, ka ebibie ya. 16I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ. 17Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi; 18mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.

Currently Selected:

DEUTERONOMI 13: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in