YouVersion Logo
Search Icon

NDI KỌLỌSI 2

2
1N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru; 2ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist, 3Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya. 4Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu. 5N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.
6Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya, 7buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
8Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di: 9n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu, 10nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula: 11ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist; 12ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n'aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n'ilusi-ọ1u-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 13Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile; 14mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya; 15mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.
16Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike: 17nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist. 18Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu, 19ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.
20Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere, 21Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka 22(bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di? 23Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

Currently Selected:

NDI KỌLỌSI 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy