YouVersion Logo
Search Icon

ỌLU NDI-OZI 4

4
1Ma mb͕e ha nāgwa ndi-Ju okwu, ndi-nchu-àjà na ọchi-agha nke ulo uku Chineke na ndi-Sadusi biakwasiri ha, 2ebe ike gwuru ha nọ̄ n'ihi na ha nēzi ndi-Ju ihe, nēkuwsa kwa nime Jisus nbilite site na ndi nwuru anwu. 3Ha we tukwasi ha aka, tiye ha n'ulo-nkpọrọ rue echi-ya: n'ihi na ọ bu anyasi ub͕u a. 4Ma ọtutu n'etiti ndi nuru okwu-ha kwere; ọnu-ọgugu ndikom ahu we rue ihe ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri.
5O we rue n'echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem; 6Anas onye-isi-nchu-àjà nọ kwa n'ebe ahu, na Kaiafas, na Jọn, na Aleksanda, na ka ha ra, bú ndi sitere n'ikwu nke onye-isi-nchu-àjà. 7Mb͕e ha guzosiri ha n'etiti, ha jua ha, si, N'àha ike gini, ma-ọbu n'aha gini, ka unu onwe-unu mere nka? 8Mb͕e ahu Pita, ebe o juputara na Mọ Nsọ, ọ si ha, Ndi-isi ndi-Ju, na ndi-okenye, 9ọ buru na ekpe ayi onwe-ayi ta ikpé bayere ọlu ọma aluru n'aru onye aru nādighi ya ike, ihe eji zọputa onye a; 10ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a. 11Onye ahu bu nkume nke unu, bú ndi nēwu ulo, kpọrọ ihe-efu, nke ghọrọ isi nkuku ulo. 12Nzọputa adighi kwa n'onye ọ bula ọzọ: n'ihi na aha ọzọ di iche adighi kwa n'okpuru elu-igwe, nke enyeworo n'etiti madu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya.
13Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori. 14Ebe ha hu-kwa-ra nwoke ahu nke emereri ka aru di ya ike ka ya na ha nēguzo, ha enweghi ihe ikwugide ya. 15Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n'èzí, ha b͕a ìzù n'etiti onwe-ha, 16si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n'ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n'aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya. 17Ma ka o we ghara ib͕asa kari n'etiti ndi-Ju, ka ayi bara ha nba, ka ha ghara igwa madu ọ bula okwu n'aha nka site n'ub͕u a. 18Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus. 19Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke: 20n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa. 21Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo. 22N'ihi na nwoke a b͕ara kari ọgu arọ abua, bú onye emereri ihe-iriba-ama nka n'aru-ya, bú ime ka aru-ya di ike.
23Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri. 24Ma mb͕e ha nuru ya, ha were otù obi welie olu-ha kpọkue Chineke, si, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi bu Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime: 25Onye sitere n'aka Mọ Nsọ, site n'ọnu nna-ayi Devid onye nējere Gi ozi, si,
N'ìhi gini ka mba nile mere oké nkpọtu,
Ndi nile di n'uwa nātughari kwa ihe-efu uche?
26Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù,
Ndi-isi zukọ-kwa-ra,
Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:
27n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi, 28ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta. 29Ub͕u a, Onye-nwe-ayi, le kwa iba-nba-ha anya: nye kwa ndi-orù-Gi ike ka ha were nkwuwa-okwu nile kwue okwu-Gi, 30n'iseti aka-Gi ime ka aru madu di ike; ka ewe me kwa ihe-iriba-ama na ọlu-ebube site n'aha Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus. 31Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.
32Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile. 33Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n'ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile. 34N'ihi na ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti ha nkpà nākpà: n'ihi na ka ha ra, bú ndi nwere ala ma-ọbu ulo, ha nēre ha, weta ọnu-ahia nile nke ihe nile erere, 35tọb͕ọ ha n'ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n'otù n'otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà.
36Ma Josef, onye ndi-ozi kpọ-kwa-ra Banabas, (nke bu, ma asugharia ya, Nwa nke nkasi-obi), bú onye Livai, onye Saiprọs n'ọmumu-ya, 37ebe o nwere ubi, o re ya, weta ego-ya, tọb͕ọ n'ukwu ndi-ozi.

Currently Selected:

ỌLU NDI-OZI 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy