YouVersion Logo
Search Icon

II. SAMUEL 22

22
1Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl: 2ọ we si,
Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;
3Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya;
Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam;
Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.
4Onye-anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova,
Ewe zọputam n'aka ndi-irom.
5N'ihi na ebili-miri nke ọnwu b͕aram buruburu,
Miri-iyi nile nke jọb͕uru onwe-ya nēme ka m'tua egwu.
6Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu;
Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum.
7Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam,
Ọ bu Chinekem ka m'nākpọku:
O we si n'ulo uku Ya nu olum,
Nkpu m'tikuru Ya ba-kwa-ra na nti-Ya abua.
8Ala we me nkpatu ma kwa jijiji,
Nto-ala nile nke elu-igwe nāma jijiji,
Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.
9Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya,
Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia:
Afunwuru icheku site na ya.
10O rulata-kwa-ra elu-igwe, rida;
Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua.
11O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we fere:
Ewe hu Ya n'elu nkù ìfùfè.
12O we do ọchichiri buruburu Ya ka ọ buru ulo-ntu,
Bú nchikọta miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.
13Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya
Afunwuru icheku ọku.
14Jehova si n'elu-igwe nāma éb͕è-elu-igwe,
Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa-ka olu-Ya da.
15O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa;
Àmùmà kwa, O we chusa ha.
16Ewe hu ebe osimiri si erù,
Anēkpughe ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi,
N'ibasi-nba-ike nke Jehova,
Site n'ume nke iku-ume nke imi-Ya.
17O si n'elu zìe, kurum,
Dọputam n'ọtutu miri;
18Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike,
N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
19Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam:
Ma Jehova burum ihe-ndabere.
20O we me ka m'puta rue ebe sara mbara:
Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
21Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di:
Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.
22N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova,
Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.
23N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum:
Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga onwem n'ebe ha di.
24M'we zue okè n'ebe Ọ nọ,
Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajọ omumem.
25Jehova we meghachim dika ezi omumem si di;
Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.
26N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere,
N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;
27N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha;
Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi Onye-nb͕á.
28I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala:
Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.
29N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova:
Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.
30N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe:
Anamesite na Chinekem wubiga mb͕idi.
31Chineke, uzọ-Ya zuru okè:
Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha;
Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.
32N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova?
Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi?
33Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku:
Ọ nākwazu kwa uzọm.
34O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele:
N'elu ebem di elu ka Ọ nēguzokwam.
35O nēzí akam abua ibu agha;
Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla.
36I nyewokwam ọta nzọputa-Gi:
Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
37I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum,
Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
38Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha;
Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.
39M'we me ka ha gwusia, anamamapú kwa ha, ha agaghi-ebili kwa:
Ha we da n'okpuru ukwum abua.
40I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha:
I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum.
41Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha,
Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
42Ha nāgha anya, ma ọ dighi onye nāzọputa ha;
N'ebe Jehova nọ ka ha nāgha anya, ma Ọ zaghi ha.
43Anamesu kwa ha me ka ha di ka ájá ala,
Anamegwe ha me ka ha di ka apiti èzí, anametisa ha.
44I we me ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim;
I nēdebem ka m'buru isi mba nile ọzọ: Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.
45Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum:
Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti.
46Ndi ala ọzọ nāta aru,
Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.
47Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa;
Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:
48Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀,
Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,
49Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua:
I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem:
I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.
50N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba ọzọ,
Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
51Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku:
Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere,
Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.

Currently Selected:

II. SAMUEL 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in