YouVersion Logo
Search Icon

II. SAMUEL 11

11
1O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.
2O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya. 3Devid we zìe jua ajuju bayere nwayi ahu. Otù onye we si, Nwayi a, ọ̀ bughi Bat-sheba, nwa-nwayi Eliam, bú nwunye Urai onye Het? 4Devid we ziga ndi-ozi, kuru ya; nwayi ahu we biakute ya, ya na ya we dina; (ma nwayi ahu si n'ọrurú-ya nēdo onwe-ya nsọ,) o we laghachi n'ulo-ya. 5Nwayi ahu we turu ime; o zìe, gosi Devid, si, Mu onwem di ime. 6Devid we zigara Joab ozi, si, Ziterem Uraia onye Het. Joab we zigara Devid Uraia. 7Uraia we biakute ya, Devid we jua ya ajuju bayere udo Joab, baye-kwa-ra udo ndi Israel, na otú agha nāga. 8Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu. 9Ma Uraia dinara n'ọnu-uzọ ulo eze n'etiti ndi-orù nile nke onye-nwe-ya, ọ ridaghi kwa rue ulo-ya. 10Ha we gosi Devid, si, Uraia aridaghi rue ulo-ya. Devid we si Uraia, Ọ̀ bughi n'ije ka gi onwe-gi si bia? gini mere i ridaghi rue ulo-gi? 11Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a. 12Devid we si Uraia, Nọdu kwa n'ebe a ta, echi ka m'gezilaga kwa gi. Uraia we nọdu na Jerusalem ubọchi ahu na echi-ya. 13Devid we kpọ ya, o we rie ihe n'iru ya, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; Devid we me ya ka ọ ṅubiga manya okè: o we pua n'anyasi idina n'ihe-ndina-ya n'etiti ndi-orù onye-nwe-ya, ma ọ ridaghi rue ulo-ya. 14O rue, n'ututu, na Devid degara Joab akwukwọ, we ziga ya site n'aka Uraia. 15O we de n'akwukwọ ahu, si, Donu Uraia na ncherita-iru agha ahu nke siri ike kari, sinu n'iso ya la azu, ka ewe tib͕ue ya, o we nwua. 16O rue, mb͕e Joab nēche obodo nche, na o tiyere Uraia n'ebe ọ mara na ndikom bu dì-nkpà nọ. 17Ndikom obodo we pua, buso Joab agha: ufọdu n'etiti ndi Israel we da, bú n'etiti ndi-orù Devid; Uraia onye Het nwu-kwa-ra. 18Joab we ziga gosi Devid ihe nile emere n'agha ahu; 19o we nye onye-ozi iwu, si, Mb͕e i gwabìri eze okwu agha nile, 20o gēru kwa, ọ buru na ọnuma nke eze ebilie, o we si gi, Gini mere unu jeruru obodo ahu nso ibu agha? ùnu amaghi na ha gēsi na mb͕idi b͕a uta? 21ònye tib͕uru Abimelek nwa Jerubeshet? nwàyi esighi na mb͕idi tua aka-nkume n'isi-ya, o we nwua na Tibez? n'ìhi gini ka unu jeruru mb͕idi nso? i gāsi kwa, Orù-gi bú Uraia onye Het, anwuwo kwa. 22Onye-ozi ahu we je, bata, gosi Devid ihe nile Joab ji zìe ya. 23Onye-ozi ahu we si Devid, Ndikom ahu di ike imegide ayi, we pukute ayi rue ọhia, ayi we bugide ha agha rue oghere ọnu-uzọ-ama. 24Ndi-ọb͕a-uta we si na mb͕idi nāb͕a ndi-orù-gi uta; ufọdu n'etiti ndi-orù eze we nwua, orù-gi, bú Uraia onye Het, anwuwo kwa. 25Devid we si onye-ozi ahu, Otú a ka i gāsi Joab, Ka ihe a ghara ijọ njọ n'anya-gi, n'ihi na mma-agha nēripia otù onye dika ọ nēripa onye ọzọ: me ka agha-gi di ike megide obodo ahu, kwadà ya: gi me kwa ka ọ di ike. 26Nwunye Uraia we nu na Uraia, bú di-ya, anwuwo, o we tiere di-ya aka n'obi. 27Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.

Currently Selected:

II. SAMUEL 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in