YouVersion Logo
Search Icon

II. IHE EMERE 23

23
1Ma n'arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu. 2Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem. 3Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid. 4Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile; 5otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile. 6Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova. 7Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata n'ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n'èzí. 8Ndi Livai na Juda nile we me dika ihe nile si di nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, nyere n'iwu: ha we chiri, nwoke ọ bula ndikom-ya, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ha na ndi nāpu apu n'ubọchi-izu-ike; n'ihi na Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, emeghi ka òkè di iche iche pua n'ije-ozi-ha. 9Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we nye ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise ube, na ọta, na ọta ntà, nke eze, bú Devid, nwereri, nke di n'ulo Chineke. 10O guzo ndi Juda nile, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya, site n'akuku aka-nri ulo ahu rue akuku aka-ekpe ulo ahu, n'akuku ebe-ichu-àjà na n'akuku ulo, n'akuku eze buruburu. 11Ha we me ka nwa eze puta, ha we kpube ya okpu-eze, nye ya ihe-àmà, me ya eze: Jehoiada na umu-ya ndikom we te ya manu; ha we si, Ka eze di ndu. 12Atalaia we nu olu ndi Juda ka ha nāb͕a ọsọ nēto kwa eze, o we biakute ndi ahu n'ulo Jehova: 13ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze. 14Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we me ka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise puta, bú ndi-nlekọta usu-ndi-agha, si ha, Menu ka ọ pua ba n'etiti ariri; ma onye nābiaso ya n'azu, ka ewere mma-agha me ka ọ nwua:n'ihi na onye-nchu-àjà siri, Unu emela ka ọ nwua n'ulo Jehova. 15Ha we doro ya onwe-ha n'akuku abua; o we ba na nbata nke ọnu-uzọ-ama inyinya n'ulo eze: ha we me ka ọ nwua n'ebe ahu.
16Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere. 17Ndi Juda nile we ba n'ulo Beal, kwatue ya, tupia ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. 18Jehoiada we tiye nlekọta nile nke ulo Jehova n'aka ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi Devid kère n'òkè ibu ndi-isi ulo Jehova, isure àjà-nsure-ọku nile nke Jehova, dika edeworo ya n'iwu Moses, n'ọṅù, na n'ibù-abù, site n'aka Devid. 19O we guzo ndi-ọnu-uzọ-ama n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo Jehova, ka onye ruru árú n'uzọ ọ bula we ghara ibà nime. 20O we chiri ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi di ike nke-uku, na ndi nāchi achi n'etiti ndi Juda, na ndi nile nke ala ahu, me ka eze si n'ulo Jehova rida: ha we si n'etiti ọnu-uzọ-ama nke di n'elu ba n'ulo eze, me ka eze nọkwasi n'oche-eze nke ala-eze. 21Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua.

Currently Selected:

II. IHE EMERE 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in