YouVersion Logo
Search Icon

I. TIMỌTI 3

3
1Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya. 2Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe; 3onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya; 4onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n'okpuru ya n'ikwesi-nsọpuru nile; 5(ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma?) 6onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n'ọmuma-ikpé ekwensu. 7Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu. 8Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku; 9ndi nēnwe ihe-omimi nke okwukwe-ayi nime akọ-na-uche di ọcha. 10Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo. 11Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile. 12Ka ndi nējere nzukọ Kraist ozi buru di nke otù nwanyi, nāchi umu-ha na èzí-na-ulo nke aka ha nke-ọma. 13N'ihi na ndi jeworo ozi nke-ọma nēnwetara onwe-ha ọnọdu ọma, na oké nkwuwa-okwu nime okwukwe nke ekwere na Kraist Jisus.
14Ihe ndia ka m'nēdegara gi n'akwukwọ, ọ bu ezie na anamele anya ibiakute gi na mb͕e ntà; 15ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu. 16Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.

Currently Selected:

I. TIMỌTI 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in