YouVersion Logo
Search Icon

I. SAMUEL 14

14
1Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya. 2Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n'okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n'aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri; 3Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo. 4Ma n'etiti ngabiga abua ahu, nke Jonatan chọrọ isi na ha gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, otú ọnu nkume di elu di n'otù ofè, otù ọnu nkume di elu di kwa n'ofè ọzọ: aha otù bu Bozez, aha nke-ọzọ bu Sene. 5Otù ọnu bu ogidi n'akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n'akuku Ndida na ncherita-iru Geba. 6Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole. 7Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n'obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ. 8Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi. 9Ọ buru na ha asi ayi otú a, Guzonu du rue mb͕e ayi ruru unu aru; ayi gēguzo kwa n'ọnọdu-ayi, ayi agaghi-arigokuru kwa ha. 10Ma ọ buru na ha asi otú a, Rigokutenu ayi; ayi gārigo kwa: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka-ayi: nka gābu-kwa-ra ayi ihe-iriba-ama. 11Ha abua we kpughere ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia onwe-ha: ndi Filistia we si, Le, ndi-Hibru nēsi n'ọnu di iche iche ebe ha zoro onwe-ha puta. 12Ndikom ebe-nguzo-ndi-agha ahu we za Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya, si, Rigokutenu ayi, ayi gēme kwa ka unu mara ihe. Jonatan we si onye nēbu ihe-agha-ya, Sorom n'azu rigo: n'ihi na Jehova enyewo ha n'aka Israel. 13Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n'azu: ha we da n'iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n'azu ya. 14Ntib͕u mbu ahu, nke Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya tib͕uru, we ra ka orú ndikom, n'ihe ra ka nkera furrow nke otù acre ala-ubi n'ọtùtù. 15Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke. 16Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.
17Sọl we si ndi ya na ha nọ, Biko, gukọtanu, hu onye siworo n'etiti ayi pua. Ha we gukọta, ma, le, Jonatan na onye nēbu ihe-agha-ya anọghi ya. 18Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu. 19O rue, mb͕e Sọl nāgwa onye-nchu-àjà ahu okwu, na ùzù nke di n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia we nāda kari, nāga n'iru nāba kwa uba: Sọl we si onye-nchu-àjà, Sepu aka-gi. 20Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di. 21Ma ndi-Hibru ndi diri ndi Filistia na mb͕e gara aga, ndi soro ha rigo n'ọmuma-ulo-ikwū buruburu, ndi ahu we chighari kwa idi n'akuku Israel ndi nọ n'aka Sọl na Jonatan. 22Ndikom nile nke Israel ndi zoro onwe-ha n'ugwu Efraim we nu na ndi Filistia ab͕alagawo, ha onwe-ha we sogidesi kwa ha ike n'agha ahu. 23Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even. 24Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu. 25Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia. 26Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu. 27Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu. 28Otù nwoke n'etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà. 29Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire. 30Ànya ndi Israel gēsi aṅa ghara inwukari enwu nke-uku, ma ọ buru na ha rijuru afọ ta site n'ihe-nkwata ndi-iro-ha nke ha hutara? n'ihi na ub͕u a ntib͕u n'etiti ndi Filistia abaghi uba. 31Ha we tib͕ue ufọdu nime ndi Filistia n'ubọchi ahu site na Mikmash rue Ajalon: ndi Israel we da #mbà nke-uku. 32Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara. 33Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta. 34Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n'etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n'ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n'iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n'aka-ya n'abali ahu, ha we b͕ue ha n'ebe ahu. 35Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova.
36Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a. 37Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu. 38Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta. 39N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile. 40O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi. 41Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya. 42Sọl we si, Fenu nzà n'etiti mu na Jonatan nwam. Nzà we ma Jonatan. 43Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu. 44Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n'ihi na i ghaghi inwu, Jonatan. 45Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu. 46Sọl we si n'iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n'ebe nke ha.
47Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha. 48O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe.
49Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal: 50aha nwunye Sọl bu Ahinoam nwa Ahimaaz: aha onye-isi usu-ndi-agha-ya bu Abnea nwa Nea, nwa-nne nna Sọl. 51Kish bu nna Sọl; Nea nna Abnea bu nwa Abiel.
52Agha we sie ike megide ndi Filistia ubọchi nile nke Sọl: mb͕e Sọl huru nwoke ọ bula bu dike, ma-ọbu nwoke ọ bula bu dìnkpà, o were ya n'onwe-ya.

Currently Selected:

I. SAMUEL 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in