YouVersion Logo
Search Icon

I. NDI-EZE 22

22
1Ha we nọdu arọ atọ agha adighi n'etiti Siria na Israel. 2O rue, n'arọ nke-atọ, na Jehoshafat, bú eze Juda, ridakuru eze Israel. 3Eze Israel we si ndi-orù-ya, Ùnu mara na ọ bu ayi nwe Remot-gilead, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti, ghara inaputa ya n'aka eze Siria? 4Ọ si Jehoshafat, Ì gēsorom je agha na Remot-gilead? Jehoshafat we si eze Israel, Dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di. 5Jehoshafat we si eze Israel, Biko, buru uzo ju ase okwu Jehova. 6Eze Israel we chikọta ndi-amuma, ra ka nnù ndikom, ọ si ha, M'gēje imegide Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu m'gārapu? Ha we si, Rigo; Onye-nwe-ayi gēnye kwa ya n'aka eze. 7Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya? 8Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. 9Eze Israel we kpọ otù onye nēje ozi, si, Me ka Maikaia nwa Imla bia ọsọsọ. 10Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha. 11Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia. 12Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 13Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Biko, le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe. 14Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu. 15O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n'aka eze. 16Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova? 17Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo. 18Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ? 19Ọ si, N'ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'akuku Ya n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya. 20Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a. 21Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya. 22Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a. 23Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi. 24Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu? 25Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi. 26Eze Israel we si, Kuru Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze; 27Igāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gābia n'udo. 28Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile. 29Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead. 30Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n'agha. 31Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya. 32O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N'ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu. 33O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi. 34Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam. 35Agha we la elu n'ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n'anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n'etiti ub͕ọ-ala-ya. 36Iti-nkpu we gazue n'ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n'obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n'ala-ya. 37Eze we nwua, ewe bubata ya na Sameria; ha we lìe eze na Sameria. 38Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n'akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n'ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru. 39Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 40Ehab we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
41Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n'arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel. 42Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi. 43O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. 44Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n'udo. 45Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? 46Ọzọ, ndi fọduru n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko, bú ndi fọduru n'ubọchi Esa nna-ya, o kpochapuru ha n'ala. 47Ma eze adighi n'Edom: onye edoro onye-isi bu eze. 48Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba. 49Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n'ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi. 50Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
51Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua. 52O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je kwa ije n'uzọ nna-ya, na n'uzọ nne-ya, na n'uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie. 53O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

Currently Selected:

I. NDI-EZE 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in