I. NDI-EZE 15
15
1Ma n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze, bú Jeroboam nwa Nebat, ka Abaijam malitere ibu eze Juda. 2Arọ atọ ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom. 3Ọ nējeghari na nmehie nile nke nna-ya, nke o buru ya uzọ me: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya. 4Ma n'ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n'ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo: 5n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het. 6Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile nke ndu-ya. 7Ma okwu Abaijam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ma agha di n'etiti Abaijam na Jeroboam. 8Abaijam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
9Ma n'arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda. 10Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom. 11Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere. 12O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere. 13Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron. 14Ma ewezugaghi ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ebe Jehova nọ ubọchi-ya nile. 15Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ. 16Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile. 17Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata. 18Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si, 19Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom gi onyinye, bú ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo. 20Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali. 21O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, we biri na Tiaza. 22Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa. 23Ma okwu Esa nile nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na ihe nile o mere, na obodo nile o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Nání na ọ riara ọria n'ukwu-ya abua na mb͕e agadi-ya. 24Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
25Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n'arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua. 26O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie. 27Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha. 28Beasha we me ka ọ nwua n'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya. 29O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo: 30n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe. 31Ma okwu Nedab nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 32Ma agha di n'etiti Esa na Beasha, bú eze Israel, ubọchi-ha nile.
33N'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, ka Beasha, bú nwa Ahaija, malitere ibu eze Israel nile nime Tiaza, orú arọ na anọ. 34O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.
Currently Selected:
I. NDI-EZE 15: IGBOB
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.