YouVersion Logo
Search Icon

I. NDI-EZE 1

1
1Ma eze, bú Devid, ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; ha we chiri uwe kpuchie ya aru, ma aru-ya ekpoghi ọku. 2Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n'obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku. 3Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n'ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag onye Shunem, me ka ọ biakute eze. 4Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya. 5Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya. 6Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom. 7Okwu-ya we di n'ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n'ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka. 8Ma Zedok, bú onye-nchu àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike ndi Devid nwere, esoghi kwa Adonaija. 9Adonaija we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na anu mara abuba chua àjà n'akuku nkume Zohelet, nke di n'akuku En-rogel; o we kpọ umu-nne-ya nile, bú umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze; 10ma ọ kpọghi Netan, bú onye-amuma, na Benaia, na ndi-dike ahu, na Solomon, bú nwa-nne-ya. 11Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi? 12Ma ub͕u a, biko, bia, ka m'dua gi ọdu, ka i we wepuga ndu-gi na ndu nwa-gi, bú Solomon. 13Je bakwuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? ọ̀ bu kwa gini mere Adonaija ghọworo eze? 14Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi n'azu bata, kwujue okwu-gi nile. 15Bat-sheba we bakuru eze rue ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku: Abishag, bú nwayi Shunem, nēje-kwa-ra eze ozi. 16Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ? 17Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem. 18Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya: 19o we chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha: ma ọ kpọghi Solomon, bú orù-gi. 20Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri. 21Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie. 22Ma, le, mb͕e ọ nọ nākpayere eze uka, Netan, bú onye-amuma, bata-kwa-ra. 23Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n'iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala. 24Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? 25N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu. 26Ma ọ kpọghm, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, ọ kpọghi kwa Zedok, bú onye-nchu-àjà, ọ kpọghi kwa Benaia nwa Jehoiada, ọ kpọghi kwa Solomon, bú orù-gi. 27Ọ̀ gābu na ihe a sitere n'aka onye-nwem, bú eze, ma i meghi ka ndi-orù-gi mara onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri? 28Eze, bú Devid, we za, si, Kpọrọnum Bat-sheba. O we bata n'iru eze, guzo n'iru eze. 29Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile, 30n'ezie dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi n'oche-ezem n'ọnọdum; n'ezie otú a ka m'gēme ta. 31Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 32Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze. 33Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon: 34ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu. 35Unu gēso kwa ya n'azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n'oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda. 36Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem eze, si otú a. 37Dika Jehova nọyeworo onye-nwem, bú eze, Ya nọyere Solomon otú a, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid. 38Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon. 39Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n'Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu. 40Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha. 41Adonaija na ndi nile akpọrọ, bú ndi ya na ha nọ, we nu ya mb͕e ha onwe-ha risiri ihe. Joab we nu olu opì-ike ahu, si, Gini mere olu a nke obodo nāb͕a aghara? 42Mb͕e ọ nọ nēkwu okwu, le, Jonatan nwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, biara: Adonaija we si, Bata; n'ihi na nwoke bu dìnkpà ka i bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka i nēzì. 43Jonatan we za, si Adonaija, N'ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze: 44eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere: 45Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo, 46Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze. 47Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya. 48Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya. 49Ndi nile akpọrọ akpọ ndi Adonaija nwere we ma jijiji, bilie, je, nwoke ọ bula n'uzọ-ya. 50Ma Adonaija turu egwu n'ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà. 51Ewe gosi Solomon, si, Le, Adonaija nātu egwu eze, bú Solomon: ma, le, o jidewo mpi ebe-ichu-àjà aka, si, Ka eze, bú Solomon, buru uzọ ṅuaram iyi na ọ gaghi-ewere mma-agha me ka orù-ya nwua. 52Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n'ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n'aru ya, ọ gānwu kwa. 53Eze, bú Solomon, we ziga, ha we me ka o si n'ebe-ichu-àjà rida. Ọ we bia kpọ isi ala nye eze Solomon: Solomon we si ya, La n'ulo-gi.

Currently Selected:

I. NDI-EZE 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in