YouVersion Logo
Search Icon

I. NDI KỌRINT 3

3
1Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist. 2Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi; 3n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu? 4N'ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu? 5Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù. 6Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba. 7Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile. 8Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di. 9N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.
10Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya. 11N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist. 12Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu; 13agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu. 14Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu. 15Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku.
16Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu? 17Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.
18Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe. 19N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: 20ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu. 21Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu; 22ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu; 23ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

Currently Selected:

I. NDI KỌRINT 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy