YouVersion Logo
Search Icon

I. IHE EMERE 6

6
1Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari. 2Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel. 3Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 4Eleeza muru Finehas, Finehas muru Abishua; 5Abishua we mua Buki, Buki mua Uzi; 6Uzi mua Zerahia, Zerahia mua Meraiot; 7Meraiot mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub; 8Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Ahimaaz; 9Ahimaaz mua Azaraia, Azaraia mua Johanan; 10Johanan mua Azaraia, (ọ bu onye ahu bu onye-nchu-àjà n'ulo Solomon wuru nime Jerusalem:) 11Azaraia mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub; 12Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Shalum; 13Shalum mua Hilkaia, Hilkaia mua Azaraia; 14Azaraia mua Seraia, Seraia mua Jehozadak; 15Jehozadak we je mb͕e Jehova mere ka Juda na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'aka Nebukadneza.
16Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari. 17Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai. 18Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel. 19Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. 20Nke Giashom; Libni nwa-ya, Jahat nwa-ya, Zima nwa-ya; 21Joa nwa-ya, Ido nwa-ya, Zera nwa-ya, Jeaterai nwa-ya. 22Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya; 23Elkena nwa-ya, Ebiasaf nwa-ya, na Asia nwa-ya; 24Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya. 25Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot. 26Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya; 27Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya. 28Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia. 29Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya; 30Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.
31Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike. 32Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di. 33Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel; 34nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa; 35nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai; 36nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraia, nwa Zefanaia; 37nwa Tahat, nwa Asia, nwa Ebiasaf, nwa Kora; 38nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, nwa Israel. 39Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n'aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea; 40nwa Maikael, nwa Baaseia, nwa Malkija; 41nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaia; 42nwa Itan, nwa Zima, nwa Shimai; 43nwa Jahat, nwa Giashom, nwa Livai. 44Umu-ndikom Merari, bú umu-nne-ha, nọ kwa n'aka-ekpe: Itan nwa Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk; 45nwa Hashabaia, nwa Amazaia, nwa Hilkaia; 46nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shemea; 47nwa Mahli, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livai. 48Enye-kwa-ra umu-nne-ha, bú ndi Livai, ifè òfùfè nile nke ebe-obibi ulo Chineke.
49Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu. 50Ndia bu kwa umu-ndikom Eron; Eleeza nwa-ya, Finehas nwa-ya, Abishua nwa-ya; 51Buki nwa-ya, Uzi nwa-ya, Zerahaia nwa-ya; 52Meraiot nwa-ya, Amaraia nwa-ya, Ahaitub nwa-ya; 53Zedok nwa-ya, Ahimaaz nwa-ya.
54Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu, 55ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya; 56ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile. 57Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile; 58na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile; 59na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile: 60site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile. 61Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà. 62Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ. 63Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà. 64Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha. 65Ha we nye obodo ndia, nke ha kpọrọ aha, site n'ebo umu Juda, site kwa n'ebo umu Simeon, site kwa n'ebo umu Benjamin, n'ife-nzà. 66Ma ufọdu nime ab͕uru umu Kohat nwere obodo ókè-ala nile ha site n'ebo Efraim. 67Ha nyere ha obodo nb͕abà, bú Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim; Gezea kwa na ebe-ita-nri-ya nile; 68na Jọkmeam na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; 69na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile: 70site kwa na nkera ebo Manase; Anea na ebe-ita-nri-ya nile, na Bileam na ebe-ita-nri-ya nile ka enyere umu Kohat fọduru. 71Enyere umu Giashom, site n'ab͕uru nkera ebo Manase, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, na Ashtarot na ebe-ita-nri-ya nile: 72site kwa n'ebo Isaka; Kedesh na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile; 73na Remot na ebe-ita-nri-ya nile, na Anem na ebe-ita-nri-ya nile: 74site kwa n'ebo Asha; Mashal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile; 75na Hukok na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile: 76site kwa n'ebo Naftali; Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, na Hamon na ebe-ita-nri-ya nile, na Kiriataim na ebe-ita-nri-ya nile. 77Enyere umu Merari, bú ndi fọduru nime ndi Livai, site n'ebo Zebulun, Rimono na ebe-ita-nri-ya nile, na Teboa na ebe-ita-nri-ya nile: 78enye-kwa-ra ha n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu Jọdan, site n'ebo Reuben, Beza n'ọzara na ebe-ita-nri-ya nile, na Jahza na ebe-ita-nri-ya nile, 79na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile: 80site kwa n'ebo Gad; Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile, 81na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile.

Currently Selected:

I. IHE EMERE 6: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in