YouVersion Logo
Search Icon

I. IHE EMERE 23

23
1Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel. 2O we chikọta ndi-isi nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai. 3Ewe gua ndi Livai ọnu site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru: ọnu-ọgugu-ha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndikom di ike, di orú nnù uzọ anọ na nnù iri-na-ise. 4Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe: 5nnù ndikom iri bu ndi-ọnu-uzọ; nnù ndikom iri nēto Jehova n'ihe m'mere iji to Ya, ka Devid kwuru. 6Devid we kè ha n'òkè, n'òkè, dika umu Livai si di; bú Giashon na Kohat, na Merari. 7Nke ndi Giashon; Ladan na Shimai. 8Umu-ndikom Ladan; onye-isi bu Jehiel, na Zitam, na Joel, atọ. 9Umu-ndikom Shimai; Shel-omot, na Haziel, na Haran, atọ. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Ladan. 10Umu-ndikom Shimai kwa; Jahat, na Zina, na Jeush, na Beria. Anọ ndia bu umu Shimai. 11Jahat bu onye-isi, Ziza bu kwa nke-abua: ma Jeush na Beria enweghi ọtutu umu-ndikom; ha we ghọ otù ulo nna site n'igukọta ha n'otù. 12Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ. 13Umu-ndikom Amram; Eron na Moses: ewe kewapu Eron, ido ya nsọ ibu onye nsọ kachasi ndi nsọ nile, ya onwe-ya na umu-ya ndikom, rue mb͕e ebighi-ebi, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova, ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue mb͕e ebighi-ebi. 14Ma Moses, bú onye nke Chineke ahu, anākpọ umu-ya ndikom aha n'etiti ebo Livai. 15Umu-ndikom Moses; Giashom, na Elieza. 16Umu-ndikom Giashon; Shebuel, bú onye-isi. 17Umu-ndikom Elieza bu kwa Rehabia, bú onye-isi. Ma Elieza enweghi umu-ndikom ọzọ; ma umu-ndikom Rehabia bara uba nke-uku. 18Umu-ndikom Izha; Shelomit, bú onye-isi. 19Umu-ndikom Hebron; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ. 20Umu-ndikom Uziel; Maika, bú onye-isi, na Ishia, bú nke-abua. 21Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Umu-ndikom Mahli; Eleeza na Kish. 22Eleeza we nwua, ma o nweghi umu-ndikom, ọ bu nání umu-ndinyom: umu-nne-ha, bú umu-ndikom Kish, we luru ha na nwunye. 23Umu-ndikom Mushi; Mahli, na Ida, na Jeremot, atọ. 24Ndia bu umu Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-ha agukọtara, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndi nēje ozi ahu diri òfùfè ulo Jehova, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba. 25N'ihi na Devid siri, Jehova, bú Chineke Israel, emewo ka ndi-Ya zuru ike; Ọ nēbi kwa nime Jerusalem rue mb͕e ebighi-ebi: 26ọzọ kwa, ndi Livai agaghi-enwe ibūru ebe-obibi na ihe-ya nile diri òfùfè-ya. 27N'ihi na n'okwu ikpe-azu Devid ka edere ndia, bú ọnu-ọgugu umu-ndikom Livai site n'onye b͕ara orú arọ we gaba. 28N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke; 29na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ; 30na iguzo kwa-ututu ikele na ito Jehova, otú a kwa n'anyasi; 31na isurere Jehova àjà-nsure-ọku nile, n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na nime mb͕e nile akara àkà, n'ọnu-ọgugu dika ikpe ekpere ha si di, mb͕e nile n'iru Jehova: 32ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.

Currently Selected:

I. IHE EMERE 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in