YouVersion Logo
Search Icon

I. IHE EMERE 19

19
1O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 2Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n'ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi. 3Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi? 4Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha. 5Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata. 6Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba. 7Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha. 8Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike. 9Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n'ọhia. 10Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n'usoro izute Siria. 11O tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n'usoro izute umu Amon. 12Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi. 13Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya. 14Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya. 15Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai nwa-nne-ya, ba n'obodo. Joab we biarue Jerusalem. 16Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha. 17Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha. 18Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua. 19Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n'udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.

Currently Selected:

I. IHE EMERE 19: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in