YouVersion Logo
Search Icon

I. IHE EMERE 16

16
1Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke. 2Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova. 3Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.
4O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel: 5ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha; 6Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.
7Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.
8Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;
Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
9Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;
Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.
10Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:
Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.
11Nāchọnu Jehova na ike-Ya;
Chọnu iru-Ya mb͕e nile.
12Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;
Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;
13Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,
Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.
14Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:
N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.
15Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,
Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;
16Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,
Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;
17O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,
Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:
18Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,
Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:
19Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;
E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;
20Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,
Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.
21O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;
O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;
22Si, Unu emetula ndim etere manu aka,
Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.
23Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;
Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
24Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,
Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
25N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:
Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.
26N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:
Ma Jehova mere elu-igwe.
27Ebube na ima-nma di n'iru Ya:
Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.
28Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,
Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
29Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:
Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:
Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.
30Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:
Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
31Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;
Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.
32Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;
Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;
33Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,
N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.
34Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
35Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,
Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile,
Ikele aha nsọ Gi,
Na inya isi n'otuto-Gi.
36Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,
Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.
Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.
37O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di: 38na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama: 39na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon, 40isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu; 41ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di; 42ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama. 43Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

Currently Selected:

I. IHE EMERE 16: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in