YouVersion Logo
Search Icon

I. IHE EMERE 14

14
1Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n'osisi, iwuru Devid ulo. 2Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n'ihi na ebuliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.
3Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ. 4Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon; 5na Ibha, na Elishua, na Elpelet; 6na Noga, na Nefeg, na Jafia; 7na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.
8Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha. 9Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim. 10Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi. 11Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim. 12Ha we rapu chi nile ha n'ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n'ọku. 13Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu. 14Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam. 15Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia. 16Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea. 17Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.

Currently Selected:

I. IHE EMERE 14: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in