Abụ nke Abụ 6
6
Ndị Enyi
1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,
ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere?
Olee ụzọ o sitere?
Ka anyị soro gị chọọ ya.
Onye a hụrụ nʼanya
2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,
nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,
ijegharị nʼetiti okoko urodi,
na ịchịkọta okoko lili.
3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.#6:4 Tịaza bụ obodo ochie eze Jeroboam họpụtara ka ọ bụrụ isi obodo ọchịchị nke alaeze ugwu. Ọ bụ na senchuri nke iri (Tupu a mụọ Kraịst). 1Ez 14:17; 1Ez 15:21,33; 16:6,8,15,23
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
nʼihi na i jirila anya gị dọta m.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu#6:5 Abk 4:2
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
6Eze gị dị ka igwe atụrụ
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ.
8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,
na iri ndị iko nwanyị asatọ,
na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.
Naanị otu nwanyị nne ya nwere,
ọ masịrị onye mụrụ ya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
Ndị Enyi
10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,
ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,
ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,
na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
12Tupu m mata ebe m nọ,
agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.
Ndị Enyi
13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;
laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya
dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
Currently Selected:
Abụ nke Abụ 6: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.