YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 87

87
Abụ Ọma 87
Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ.
Abụ maka Zayọn
1Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;
2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,
karịa ebe obibi niile nke Jekọb.
3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,
O obodo Chineke; Sela
4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn,
dịka ndị na-asọpụrụ m,
aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,
aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ”
5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,
“A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,
ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”
6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:
“A mụrụ onye a na Zayọn.”
7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,
“Isi iyi m niile dị na gị.”

Currently Selected:

Abụ Ọma 87: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in