YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 8

8
Abụ Ọma 8
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit.
Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ
1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!
I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe.
2Site nʼotuto#8:2 Mat 21:16 ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta#8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi ha?
5I mere ka ha#8:5 Maọbụ, ya dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi#8:5 Maọbụ, Chineke nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
8na nnụnụ niile,
na azụ niile,
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
9O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.

Currently Selected:

Abụ Ọma 8: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in