YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 77

77
Abụ Ọma 77
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma.
Nkasiobi nʼoge nsogbu
1Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,
mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela
4I kweghị ka anya m abụọ mechie;
nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
na afọ niile ndị gara aga.
6Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
7“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
8Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
9Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela
10Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
11Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
12Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
13O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
14Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela
16Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
osimiri hụrụ gị, taa;
ogbu mmiri mere mkpọtụ.
17Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;
àkụ gị gburu amụma ebe niile.
18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
amụma gị nyere ụwa niile ihe;
elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,
ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
20I sitere nʼaka Mosis na Erọn
duo ndị gị dịka igwe atụrụ.

Currently Selected:

Abụ Ọma 77: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in