YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 64

64
Abụ Ọma 64
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka nchekwa
1Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.
Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.
2Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,
site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.
3Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,
na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.
4Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,
na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.
5Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,
ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo,
ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya#64:5 Maọbụ, onye ga-ahụ anyị?”
6Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,
“Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!”
Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.
7Ma Chineke ga-agba ha àkụ,
na mberede ka a ga-etida ha.
8Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,
mee ka ha laa nʼiyi;
ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.
9Mmadụ niile ga-atụ egwu,
ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke,
ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.
10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
ha ga-agbabakwa nʼime ya;
ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.

Currently Selected:

Abụ Ọma 64: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in