YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 45

45
Abụ Ọma 45
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Okoko osisi lili.” Abụ maskil ụmụ Kora. Abụ maka agbamakwụkwọ.
Abụ ọlụlụ nwunye eze
1Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ.
2I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi.
3Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
4Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ#45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
12Ada Taịa#45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan. ga-eji onyinye bịa;
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
13Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.
14Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi
mgbe e dubatara ya nʼụlọeze.
15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
ha bara nʼime ụlọeze.
16Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.
17Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;
nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.

Currently Selected:

Abụ Ọma 45: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in