YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 43

43
Abụ Ọma 43
Arịrịọ maka enyemaka
1O Chineke, kpepụta m,
kpechitere m ikpe m
nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;
gbapụta m site nʼaka
ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.
2Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.
Gịnị mere i ji jụ m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,
nʼihi mmegbu nke onye iro?
3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,
ka ha duo m;
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,
bụ ebe i bi.
4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.
Aga m eji ụbọ akwara too gị,
O Chineke, bụ Chineke m.
5O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
onye Nzọpụta m na Chineke m.

Currently Selected:

Abụ Ọma 43: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in