YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 29

29
Abụ Ọma 29
Abụ Ọma Devid.
Olu Onyenwe anyị
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe#29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13 nʼelu oke osimiri.
4Olu Onyenwe anyị dị ike,
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn#29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 wulie elu dịka nwa atụ.
7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu.
8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ#29:9 Ime na-eme nne ele
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
10 Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
11 Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,
ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.

Currently Selected:

Abụ Ọma 29: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in