YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 138

138
Abụ Ọma 138
Abụ Ọma Devid.
Onyenwe anyị bụ onye kwesiri ntụkwasị obi
1O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;
nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto.
2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị
aga m etokwa aha gị
nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị,
nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị
dị elu karịa ihe niile.#138:2 Aịz 42:21
3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;
i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.
4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,
mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu.
5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.
6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,
ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.
7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,
ị na-echebe ndụ m;
ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,
ị na-eji aka nri gị zọpụta m.#138:7 Abụ 23:3-4
8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;#138:8 Fil 1:6
ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ahapụkwala ọrụ aka gị niile.

Currently Selected:

Abụ Ọma 138: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in