YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Ọma 129

129
Abụ Ọma 129
Abụ nrigo.
Ekpere megide ndị iro Izrel
1Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ka Izrel kwuo.
2“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge,
ma ha enweghị ike merie m.
3Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi,
mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.
4Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume;
ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
5Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị
bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.
6Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ
nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;#129:6 Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2
7nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ,
maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
8Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha,
“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu.
Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”#129:8 Rut 2:4

Currently Selected:

Abụ Ọma 129: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

Video for Abụ Ọma 129