YouVersion Logo
Search Icon

Ilu 19

19
1Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi
karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
2Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma
otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm,
ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,
ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ,
ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ,
otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị,
gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme?
Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ
ezughị ime ka ha nọgide.
8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,
onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ,
onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya;
ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi;
ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm.
Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna,
nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm,
mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna,
ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra,
onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.
16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ,
ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ.
17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe,
ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere.
18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị.
Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi.
19Onye oke iwe ga-anata nra so ya,
nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ.
20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị.
Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe.
21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;
maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ,
na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri,
ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya.
25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche,
baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
26Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
27Nwa m ọ bụrụ na ị hapụ ige ntị na ntụziaka m,
ị ga-esi nʼokwu ihe ọmụma kpafuo.
28Onyeama ụgha na-akwa ikpe ziri ezi emo.
Ọnụ nke onye ajọ omume na-eloda ajọ ihe.
29Ndị na-akwa emo na ndị nzuzu ga-ata ahụhụ;
a ga-etikwa ha ihe.

Currently Selected:

Ilu 19: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in