YouVersion Logo
Search Icon

Levitikọs 12

12
Ịdị ọcha nke nwanyị mụrụ nwa ọhụrụ
1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, 2“Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka. 3Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu. 4Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị. 5Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
6“ ‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie. 7Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya.
“ ‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị. 8Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’ ”

Currently Selected:

Levitikọs 12: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in