YouVersion Logo
Search Icon

Abụ Akwa Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ abụ akwa gbasara mbibi ndị agha Babilọn bibiri Jerusalem. O bụ Jeremaya dere ya, gosi anyị ụdị ịla nʼiyi bịakwasịrị Jerusalem. O si otu a mee ka o doo onye ọbụla anya ụdị ahụhụ na-eche ndị Chineke ahụ kpachapụrụ anya jụ irubere Chineke isi. Akwụkwọ Abụ Akwa na-egosi anyị ọnụma Chineke nʼuju ya. Ma o mekwara ka anyị mata na ikwesi ntụkwasị obi Chineke dị ukwuu, na ọ dịghị agwụ agwụ, kama ọ na-apụta ihe ụbọchị niile. Obi ebere Chineke adịghị agwụkwa agwụ.
Usoro e si dee ya:
Ịla nʼiyi na iru ụjụ nke Jerusalem 1
Ọnụma Chineke megide mmehie Jerusalem 2
Olileanya ntute dabeere nʼobi ebere Chineke 3
Ọnọdụ Jerusalem na mbụ na ọnọdụ ya ugbu a 4
Ekpere maka nzọpụta 5

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in