YouVersion Logo
Search Icon

Jeremaya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ ihe gbasara ọrụ ibu amụma nke Jeremaya rụrụ na Juda. Jeremaya dọrọ ndị bi nʼoge ya aka na ntị sị ha nabatara onwe ha ikpe ọmụma nke Chineke na-aga inye ha nʼihi mmehie ha. O mere ka o doo ndị Juda anya na Chineke enyefeela ha nʼaka ndị agha Babilọn ndị ga-emeri ha nʼagha, gbuchapụ ndị niile bi na Jerusalem, ma mebikwaa ụlọnsọ ukwu Chineke. Ọ rịọsiri ha arịrịọ ike sị ha chegharịa, ma site na mmehie ha tụgharịa, ma ha aṅaghị ya ntị. Kama ịṅa ya ntị, ha kparịrị ya, taa ya ahụhụ nʼụzọ dị iche iche. Jeremaya bukwara amụma kwuo ihe Chineke na-ezube imere ndị ya nʼoge dị nʼihu.
Usoro e si dee ya:
Amụma banyere Juda 1–25
Amụma ndị ọzọ 26–42
Amụma Jeremaya buru nʼIjipt 43–45
Amụma banyere mba dị iche iche 46–51
Akụkọ dị iche iche 52

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in