YouVersion Logo
Search Icon

Aịzaya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ihe e dere nʼakwụkwọ a bụ ihe gbasara ọrụ ibu amụma nke Aịzaya rụrụ nʼala Juda nʼoge ọchịchị ndị eze Juda anọ. Aịzaya rụrụ ọrụ ya naanị na Juda, ma ọ dịkwa ndụ mgbe ndị agha Asịrịa bịara merie ndị Izrel, ma dọtakwa ha nʼagha. Amụma dị iche iche Aịzaya buru dị nʼakwụkwọ a. Ụfọdụ nʼime amụma ndị a metụtara nnapụta Chineke napụtara Juda site nʼaka eze Asịrịa, ndọta nʼagha a ga-emesịa dọta ndị Juda; nlọghachi ndị Juda site nʼala ebe ndị dọtara ha nʼagha bulara ha; ọbịbịa nke Onye nzọpụta, na ọbịbịa nke alaeze Chineke nʼoge dị nʼihu, mgbe ibu agha na-agaghị adịkwa.
Usoro e si dee ya:
Amụma banyere Juda na mba ndị ọzọ 1–23
Ikpe ọmụma dịrị ụwa nʼihi mmehie 24–27
Amụma banyere Juda na Izrel 28–35
Ọrụ Aịzaya nʼoge ọchịchị Hezekaya 36–39
Nzọpụta Chineke na ọnọdụ Juda nʼoge dị nʼihu 40–66

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in