YouVersion Logo
Search Icon

Hosiya Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Hosiya bụ onye amụma Chineke. O buru amụma ya nʼala Izrel tupu ndị agha Asịrịa abịa laa obodo ahụ nʼiyi. Ihe abụọ pụtara ihe nʼakwụkwọ Hosiya bụ, ịhụnanya Chineke, na njehie ndị Izrel. Chineke sitere nʼihe mere nʼezinaụlọ Hosiya gosi ihe na-eme nʼetiti ya na ndị Izrel. Dị ka nwunye Hosiya si hapụ ya pụọ na-esogharị ụmụ nwoke ndị ọzọ, otu a ka Izrel si hapụ Chineke bido na-esogharị chi ndị ọzọ. Ma dị ka Hosiya si nọgide hụ nwunye ya nʼanya, otu a kwa ka Chineke si nọgide hụ Izrel nʼanya. Ndị amụma ọzọ buru amụma nʼoge Hosiya bụ Emọs, Aịzaya na Maịka.
Usoro e si dee ya:
Ọnọdụ ezinaụlọ Hosiya 1–3
Nnupu isi Izrel megide Chineke 4–8
Ikpe ọmụma nke na-abịa 9–13
Nkwa nzọpụta 14

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in