Hegai Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Hegai na Zekaraya rụkọrọ ọrụ ha nʼotu oge. Chineke zitere ha ikwusa ozi ya nye ndị Juu ahụ si Babilọn lọta, na ịgba ha ume nʼọrụ ha na-arụ iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke. Ozi dị nʼakwụkwọ a bụ ndị e ziri mmadụ abụọ, Zerubabel onye bụ gọvanọ nʼoge ahụ, na Joshua, onye nchụaja. Ụzọ ozi ise dị nʼakwụkwọ a. Ozi ndị a nyekwara aka ịkwalị obi ndị mmadụ elu tutu ha arụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.
Usoro e si dee ya:
Ịba mba maka ịgbakụta ụlọnsọ ukwu azụ 1:1-11
Ihuọma Chineke 1:12-15
Ịgbaume nye ndị na-ewu ụlọ ahụ 2:1-9
Ngọzị so iwu ụlọnsọ ukwu 2:10-19
Ikpe ọmụma Chineke megide mba dị iche iche 2:20-23
Currently Selected:
Hegai Ihe dị nʼime ya: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.