Jenesis 16
16
Hega na Ishmel
1Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega. 2Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ.#16:2 Amụtaghị nwa bụ ihe ndị mmadụ na-ahụta dị ka ntaramahụhụ si nʼaka Chineke. Ọ bụrụ na nwanyị amụtaghị nwa, nʼebe ụfọdụ, omenaala na-akwado ya ị họtara di ya nwanyị ọzọ, onye ga-amụrụ ya ụmụ. Ụmụ niile nwanyị ahụ ga-amụta na-abụ nke nwanyị ahụ na-amụtaghị nwa. Jen 20:18; 30:3 Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.”
Ebram kweere ihe Serai kwuru. 3Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan. 4Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime.
Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya. 5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
6Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua, 8jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?”
Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
9Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.” 10Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịkwa ya, “Aga m amụba ụmụ gị, ka a hapụ inwe ike ịgụta ole ha dị.”
11Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwakwara ya sị,
“Ị dị ime ugbu a,
ị ga-amụ nwa nwoke.
Aha ị ga-agụ ya bụ Ishmel
nʼihi na Onyenwe anyị anụla maka nhụju anya gị.
12Nwoke dịka ịnyịnya ibu a na-azụghị azụ ka ọ ga-abụ.
Ọ ga-emegide onye ọbụla,
onye ọbụla ga-emegidekwa ya.
Ọ ga-ebi nʼime ibu iro,
megide ụmụnna ya niile.”
13Hega kpọkuru aha Onyenwe anyị, onye gwara ya okwu sị, “Ị bụ Chineke m na-ahụ m.” Nʼihi na Hega kwuru sị, “Ahụla m, ugbu a, onye ahụ na-ahụ m.” 14Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ olulu mmiri ahụ, Bịa-Lahai-Rọị.#16:14 Ma o bụ, Olulu Mmiri nke Onye ahụ dị ndụ na-ahụ m. Ọ ka dị ebe ahụ, nʼetiti Kadesh na Bered.
15Emesịa, Hega mụtaara Ebram nwa nwoke. Ebram kpọrọ nwa nwoke ahụ Hega mụtaara ya Ishmel. 16Ebram gbara iri afọ asatọ na isii mgbe Hega mụtaara ya Ishmel.
Currently Selected:
Jenesis 16: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.