Izikiel Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Izikiel bụ otu nʼime ndị nchụaja a dọtara nʼagha mgbe ndị agha Babilọn lara Juda nʼiyi. Ọ bụ na Babilọn ka ọ nọ malite ọrụ dị ka onye amụma Chineke. O buru amụma kwuo na ikpe ọmụma ọzọ ga-abịakwasị ndị Juda ahụ fọdụrụ na Jerusalem. Ma ndị Juu ya na ha nọ na Babilọn jụrụ ịnabata amụma o buru. Nʼikpeazụ, amụma ahụ o buru banyere Jerusalem mezuru (lee anya nʼisi 33:21), nʼihi ya, ndị Juu ibe ya malitere ịṅa ya ntị. Chineke sitere nʼọnụ ya gbaa ha ume, gosi ha na olileanya dị, na ha ga-emesịa lọghachikwa nʼala nke aka ha. Akwụkwọ Izikiel na-egosi ihe abụọ banyere Chineke, onye dị nsọ. Nke mbụ, ọ na-egosi na Chineke aghaghị ikpe ajọ omume ikpe. Nke abụọ, ọ na-egosi na ikwesi ntụkwasị obi Chineke na-adịgidere ndị niile na-ejezi ije dị ka iwu ya na ụkpụrụ ya si dị.
Usoro e si dee ya:
Ọkpụkpọ Izikiel 1–3
Amụma megide Izrel na Jerusalem 4–24
Amụma megide mba dị iche iche 25–32
Nkwa nlọghachi nke ndị a dọtara nʼagha 33–39
Ụlọnsọ ukwu dị nʼalaeze Chineke 40–48
Currently Selected:
Izikiel Ihe dị nʼime ya: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.