Ọpụpụ Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
E dere ihe dị nʼakwụkwọ Ọpụpụ maka ịkọwa otu ndị Izrel, ụmụ ụmụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb si ghọọ otu mba, na otu e si kpọọ Mosis ka ọ bụrụ onye ga-edu ndị a Chineke họpụtara nye onwe ya, inwere onwe ha site nʼọnọdụ ibu ndị ohu. A kọrọ akụkọ ihe ịrịbama niile Chineke mere site nʼaka Mosis, nke o ji mee ka Fero eze Ijipt, kwenye ka ụmụ Izrel si nʼIjipt pụta, ka ha malite ịga nʼala ahụ e kwere nkwa inye ha. A kọkwara otu ụmụ Izrel si gafee Osimiri Uhie, otu mmiri si rie ndị Ijipt na-achụ ha ọsọ, kọwaakwa otu ha si rute nʼugwu Saịnaị ebe Chineke nọ nye ha iwu iri ya, na otu Mosis si nata iwu dị iche iche nke e nyere maka iwu ụlọ nzute, na otu ụmụ Izrel si wuo ụlọ nzute ahụ.
Usoro e si dee ya:
Ọnọdụ ịbụ ohu nʼala Ijipt 1
Ọmụmụ Mosis na ndụ ya 2:1–7:7
Ihe otiti, Ngabiga, na Ọpụpụ 7:8–15:21
Site nʼIjipt ruo nʼUgwu Saịnaị 15:22–24:18
Iwu e nyere maka iwu ụlọ nzute 25:1–31:18
Mmehie Izrel na ịdọ aka na ntị 32:1–35:3
Owuwu ụlọ nzute 35:4–40:38
Currently Selected:
Ọpụpụ Ihe dị nʼime ya: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.