YouVersion Logo
Search Icon

Diuteronomi 32

32
1Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu!
Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ.
2Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo
ka okwu m daa dịka igirigi,
ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa,
dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.
3Aga m eto aha Onyenwe anyị
toonu ịdị ukwuu Chineke anyị!
4Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke,
ụzọ ya niile ziri ezi.
Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ,
onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.
5Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya,
ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe
6Ọ bụ otu a ka unu si emeso Onyenwe anyị
unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche?
Onyenwe anyị ọ bụghị nna unu, onye kere unu,
onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike?
7Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga,
tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga
jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị.
Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.
8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha,
mgbe o kesara ụmụ mmadụ,
mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile
dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya
Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya,
nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ.
O kpuchitere ya, lezie ya anya,
o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya,
nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya,
nke na-agbasapụ nku ya ijide ha,
nke na-ebu ha na nku ya,
12 Onyenwe anyị naanị ya duru ya,
chi ala ọzọ esokwaghị ya.
13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ,
jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya.
O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya,
ya na mmanụ si nʼoke nkume,
14na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ,
na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba,
na oke ebule Bashan dị ezi mma,
tinyere ezi obi ọka wiiti.
Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.
15Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya,
ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya.
Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya,
jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya.
16Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,
meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
17Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
18Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.
19 Onyenwe anyị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha,
nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe.
20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru,
“ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ,
nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ,
ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.
21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m,
jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m.
Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha,
sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.
22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m,
ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa.
Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile,
ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.
23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha,
zipụ àkụ m niile megide ha.
24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha,
na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu.
Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha,
na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.
25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha.
Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi,
ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha,
hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.
27Ma ihe banyere ịnya isi onye iro tinyere m ụjọ nʼobi,
ka onye iro ghara ịghọtahie kwuo sị,
‘Aka anyị ewetarala anyị mmeri,
ọ bụghị Onyenwe anyị mere ihe ndị a niile.’ ”
28Ha bụ mba na-enweghị uche,
ndị na-enweghị mmụọ nghọta ọbụla nʼime ha.
29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche
nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.
30Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,
kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ,
ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha,
ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ?
31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị,
dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.
32Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm,
na nʼubi dị na Gọmọra
mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi,
ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.
33Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ,
elo ajụala na-ebute ọnwụ.
34“Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge,
chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m?
35Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi.
Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ,
ụbọchị mbibi ha na-abịa nso,
ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”
36 Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe,
ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị ohu ya,
mgbe ọ hụrụ na ike ha nwere agwụla,
mgbe otu onye na-agaghị afọdụ, ohu na onye nwe onwe ya.
37Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ,
bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya,
38chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha,
ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ?
Ha bilie bịa nyere unu aka!
Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!”
39“Ugbu a, hụnụ na mụ onwe m abụ m ya!
Ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị m.
Mụ onwe m na-eme ka a nwụọ, mụ onwe m na-eme ka a dị ndụ.
Mụ onwe m na-etipụ mmadụ ọnya, mụ onwe m na-agwọ ya,
mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụta onye m ji nʼaka m.
40Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị,
dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,
41mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma,
mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe,
aga m abọ ọbọ megide ndị iro,
kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị.
42Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ,
ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ,
ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha,
na isi ndị ndu ndị iro.”
43Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,
nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,
ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya,
kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.
44Mosis na Joshua#32:44 Joshua Hosea bụ ụzọ ọzọ e si akpọ aha a nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel. 45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel, 46ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. 47Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”
Ọnwụ Mosis nʼugwu Nebo
48Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 49“Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha. 50Mgbe ị hụsịrị ala a, ị ga-anwụ nʼebe ahụ nʼelu ugwu ahụ, lakwurukwa nna nna gị ha, dịka Erọn nwanne gị si nwụọ nʼugwu Hor, lakwuru ha. 51Nʼihi na gị na Erọn jụrụ irubere m isi nʼihu ụmụ Izrel, na mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin, unu edoghị m nsọ nʼihu ndị Izrel.#32:51 Ọnụ 20:11-13 52Nʼihi ya, ị ga-esite nʼebe dị anya hụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel, ma ị gaghị aba nʼime ya.”

Currently Selected:

Diuteronomi 32: BIU

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in