YouVersion Logo
Search Icon

Daniel Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Daniel so na ndị a dọtara nʼagha mgbe e bibiri Jerusalem. Ma mgbe ọ nọ na Babilọn o nwetara ọzụzụ pụrụ iche, mesịa ghọọ otu nʼime ndị ozi eze Babilọn pụtara ihe. Ọ bụkwa otu nʼime ndịisi ọchịchị nʼoge ndị Peshịa bidoro ịchị. Daniel bụ onye nwere okwukwe nʼime Chineke, onye e sitere nʼihi okwukwe dị otu a o nwere tụnye nʼime olulu ọdụm. Akwụkwọ a kọrọ akụkọ ndụ Daniel, na ọtụtụ ihe dị iche iche mere nʼoge ya. Ma e nwere amụma dị iche iche e depụtara nʼime ya nke gbasara ihe ga-emezu nʼoge dị nʼihu. Daniel buru amụma banyere alaeze ukwu dị iche iche nke ga-adị nʼoge dị nʼihu, bukwaa amụma banyere Onye ahụ e tere mmanụ, bụ Jisọs Kraịst, onye ga-abịa laa ike ọjọọ nke ụwa nʼiyi, ma malite ọchịchị alaeze ya, nke dabeere nʼezi omume, alaeze nke ga-adịgide ruo mgbe niile.
Usoro e si dee ya:
Ndụ Daniel na Babilọn 1–6
Ọhụ Daniel hụrụ 7–8
Ekpere Daniel na amụma o buru 9
Ọhụ Daniel banyere ihe ndị ga-eme nʼoge dị nʼihu 10–12

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in