YouVersion Logo
Search Icon

Ndị Kọlọsị Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Pọl dere akwụkwọ a nʼoge e tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ na Rom nʼihi ikwusa oziọma. Nʼakwụkwọ a Pọl mere ya ka ọ pụta ìhè na Kraịst bụ isi ihe niile. Ọ kọwaara na ndụ juru afọ dị nʼime Kraịst, na onye nwere Kraịst nwezuru ihe niile. Ọ dọrọ ndị Kraịst aka na ntị sị ha ekwela ka e jiri ozizi ụgha si nʼamamihe mmadụ duhie ha. Ozizi banyere ibi ndụ dị ka onye Kraịst dịkwa nʼakwụkwọ a.
Usoro e si dee ya:
Ekpere Pọl 1:1-14
Ịdị ukwuu nke Kraịst 1:15–2:5
Ịdọ aka na ntị banyere ozizi ụgha 2:6-23
Ibi ndụ nke onye Kraịst 3:1–4:6
Okwu mmechi 4:7-13

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in