YouVersion Logo
Search Icon

2 Timoti Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Pọl nọ nʼụlọ mkpọrọ mgbe o dere akwụkwọ a. Ndị ọkachamara akwụkwọ nsọ chịkọtara aka kwuo na Timoti nke abụọ nwere ike bụrụ akwụkwọ ikpeazụ Pọl dere tupu e gbuo ya nʼihi okwukwe ya, na nʼihi ọrụ nkwusa oziọma ya. Nʼakwụkwọ a Pọl gosiri mkpa ọ dị na onye Kraịst ọbụla ga-ejidesi eziokwu dị nʼoziọma ahụ aka ike. Ọ kọwara na oge na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ige ntị nʼihe akwụkwọ nsọ kwuru. Nʼihi ya o kwesiri ka Timoti nọgidesie ike nʼekwusa oziọma ahụ nʼọnọdụ ọbụla.
Usoro e si dee ya:
Ekele Pọl nʼisi Timoti 1:1-5
Iwu Pọl nyere Timoti 1:6-18
Odibo kwesiri ntụkwasị obi 2
Ekweghị ekwe nke oge dị nʼihu 3:1-9
Okwu mmechi 3:10–4:22

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in