2 Ndị Eze Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akụkọ a kọrọ nʼakwụkwọ a mezuru nʼala Izrel na Juda nʼime narị afọ abụọ na iri afọ ise. Nʼoge a, ụzọ oke ịla nʼiyi abụọ bịakwasịrị alaeze Izrel na nke Juda. Na mbụ, ndị Asịrịa bibiri ala Izrel bụ alaeze dị nʼakụkụ ugwu. Otu a kwa ndị Babilọn mesịrị bịa bibie ala Juda, bụ alaeze dị na ndịda. A kọrọ akụkọ ọchịchị ndị eze dị iche iche, ma ndị chịrị nʼIzrel, na ndị chịrị na Juda. A kọrọ akụkọ ndị eze ndị a igosi ụdị ọchịchị ha chịrị, ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Nʼime akụkọ ndị a niile e gosiri otu Chineke si nọgide na-arụ ọrụ ya, nʼoge agha, ma nʼoge udo; nʼoge iriju afọ, na nʼoge ụkọ; nʼoge ndị eze na-achịzi, na nʼoge ọchịchị ọjọọ. Chineke nọgidere nʼoge ndị a niile na-ezite ndị amụma ya ka ha kwusaa okwu ya, ma dọọ ndị mmadụ aka na ntị banyere ikpe ọmụma nke na-abịa.
Usoro e si dee ya:
Ọgwụgwụ oge ije ozi Ịlaịja 1:1–2:11
Ije ozi Ịlaisha 2:12–8:15
Ọchịchị ndị eze ruo na mbibi Izrel 8:16–17:41
Ọchịchị ndị eze ruo na mbibi Jerusalem 18–25
Currently Selected:
2 Ndị Eze Ihe dị nʼime ya: BIU
Highlight
Share
Copy
Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.